Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Samuel, Onye-amụma Testament Ochie


Samuel, Onye-amụma Testament Ochie

Nwa-nwoke nke Elkena na Hana. A mụrụ Samuel n’ọzịza nke ekpere nile nke nne ya (1 Sam. 1). Dịka nwantakịrị e dobere ya na nlekọta anya nke Elaị, onye isi nchụ-aja n’ụlọ-ofufe di na Shaịlo (1 Sam. 2:11; 3:1). Onye-nwe kpọrọ Samuel na mgbe o dị nta ịbụ onye-amụma (1 Sam. 3). Mgbe Elaị nwụsịrị Samuel ghọrọ nnukwu onye-amụma na onye-ikpe nke Israel ma weghachiri iwu, usoro, na ofufe nke okpukpe-chi a na-eme n’usoro n’ala ahụ (1 Sam. 4:15–18; 7:3–17).

1 Sam. 28:5–20 nwere otu nkọwasị nke Samuel ebe a kpọghachiri ya azụ site n’ọnwụ site n’aka nwanyị na-agba afa nke Endọa na arịrịọ nke Eze Sọl. Nke a agaaraghị abụ ótù ọ̀hụ́ sitere na Chineke n’ihi na Onye amụsụ ma-ọbụ onye ọzọ na-agba afa nke mụọ enweghị ike isite n’ike na-arụ orụ n’ime mee ka onye-amụma pụta na arịrịọ ya bụ nwoke ma-ọbụ nwanyị (1 Sam. 28:20; 31:1–4).

Akwụkwọ nile nke 1 na 2 Samuel

N’ime Bible ụfọdụ nile, akwụkwọ nile nke 1 na 2 Samuel bụcha otu akwụkwọ. Na ndị ọzọ ha bụ akwụkwọ abụọ. Akwụkwọ nile ahụ kpuchitere oge dịka afọ nile dị 130, site n’ọmụmụ Samuel ruo nanị tutu ọnwụ Eze Devid.

Akwụkwọ nke 1 Samuel

Isi nile nke 1–4 na-akọwa nke ọma na Onye-nwe bụrụ-ọnụ ma taa ezi na ụlọ Elaị ahụhụ ma kpọọ Samuel dịka onye isi nchụ-aja na onye-ikpe. Isi nile nke 4–6 na-akọ otu igbe ọgbụgba-ndụ si daba n’aka nile nke ndị Filistịa. Isi nile nke 7–8 dekọtara ịdọ-aka na ntị nile nke Samuel banyere inwe chi ụgha nile na otu eze bụ ajọọ mmadụ. Isi nile nke 9–15 na-akọwa nke ọma ikpube Sọl okpu-eze na ọchịchị ya dịka eze. Isi nile nke 16–31 na-akọ akụkọ nke Devid na inweta ike ya—Samuel tere Devid mmanụ onye gbuworo Golaịat. Sọl kpọrọ Devid asị kama Devid jụrụ igbu Sọl na-agbanyeghị na o nwere ohere ime otu ahụ.

Akwụkwọ nke 2 Samuel

Akwụkwọ ahụ nwere ịkọwadaru ala nile nke ọchịchị Devid dịka eze nke Juda na ikpe-azụ, nke Israel dum. Isi nile nke 1–4 na-egosi ogologo ibu-agha n’etiti ndị na-eso Devid mgbe Juda kpubesịrị ya okpu-eze, na ndị na-eso Sọl. Isi nile nke 5–10 na-egosi Devid ịdịwanye ike gazuo ọtụtụ ala nile. Isi nile nke 11–21 na-egosi nlaghachi-azụ nke ike nke mụọ Devid n’ihi mmehie ya nile na nnupụ-isi ahụ di n’ime etiti ezi na ụlọ nke onwe ya. Isi nile nke 22–24 na-akọwa nke ọma mgbalị Devid ime udo ya na Onye-nwe.