Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Inọk


Inọk

Onye-amụma ahụ duziri ndị nnukwu Obodo Zaiọn. Ije-ozị ya ka a kparịtara-ụka maka ya n’ime Testament Ochie, na Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahia. Ọ bụụrụ onye-isi ezi na ụlọ nke asaa mgbe Adam gasịrị. Ọ bụ nwa-nwoke nke Jared na nna Metusela (Jen. 5:18–24; Luk 3:37).

Inọk bụụrụ nnukwu mmadụ na nwekwara ije-ozị pụtara-ìhè karịa nwankenke nkọwa nke Bible gosiri maka ya. Bible depụtara na e nwogharịrị ya enwogharị (Ndị-Hib. 11:5) mana o nyeghị nkọwa daruru ala maka ije ozi ya. Jud. 1:14 nwere otu nn̄omi nke amụma o buru. Mkpughe ụbọchị ikpe-azụ a na-akọwa hie nne maka Inọk karia kpọm kwem Ikwusa ozi-ọma ya, nnukwu obodo ya a kpọrọ Zaịọn, ọhụ ya nile, na amụma ya nile (OznỌd. 107:48–57; Moses 6–7). Zaịọn ka e wegara n’elu-igwe n’ihi ezi-omume nke ndị ahụ bụ ndị biiri n’ime ya (Moses 7:69).