Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị Eze


Ndị Eze

Akwụkwọ abụọ dị n’ime Testament Ochie. Akwụkwọ ndị a na-akọ akụkọ nke Israel site na nnupụ-isi nke Adonaija, nwa-nwoke nke anọ nke Eze Devid (ihe dịka 1015 Tutu a mụọ Kraịst), ruo na ndọkpụ n’agha ikpeazụ nke Juda (ihe dịka 586 Tutu a mụọ Kraịst). Ha sonyere akụkọ nile nke ala-eze mpaghara elu-elu (agbụrụ iri nke Israel) site na nkewa ruo na mgbe ndị Asiria weere ha na ndọkpụ n’agha baa na mba nile ndị dị n’elu-elu.

Ndị-eze nke Mbụ

Isi nke 1 na-akọwa nke ọma ụbọchị ndị ikpeazụ nke ndụ Eze Devid. Isi nile nke 2–11 dekọtara ndụ Solomọn. Isi nile nke 12–16 na-akọ maka ndị nọchiri anya Solomọn ngwa-ngwa, Rehoboam na Jeroboam. Jeroboam kpatara nkewa nke ala-eze nke Israel. A kpọtụkwara ndi-eze ndi-ọzọ ọnụ. Isi nile nke 17–21 dekọtara mpaghara nile nke ije-ozị nke Elaịja dịka mgbe ọ na-adọ Ehab, eze nke Israel aka na ntị. Isi nke 22 dekọtara otu ibu-agha megide Siria n’ime nke Ehab na Jehoshafat, eze nke Juda jikọtara ndị agha ọnụ. Onye amụma Maịka buru amụma megide ndị eze ahụ.

Ndị-eze nke Abụọ

Isi nke 1:1– 2:11 gara n’iru na ndụ nke Elaịja, tinyere mbilite Elaịja gaa n’elu-igwe n’ime ụgbọ-ala ọkụ. Isi nile nke 2–9 kọrọ ije-ozị nke okwukwe na nke nnukwu ike nke Elaisha. Isi nke 10 na-akọ maka Jehu, eze ahụ, na ka o siri bibie ụlọ nke Ehab na ndị nchụ-aja nile nke Baal. Isi nile nke 11–13 dekọtara ọchịchị ezi-omume nke Jehoash na ọnwụ nke Elaisha. Isi nile nke 14–17 na-akọ banyere otutu ndị-eze ndị chịrị na Israel na Juda, otụtụ mgbe n’ime ajọọ omume. Isi nke 15 dekọtara mnwude nke ndị Asiria nwudere agbụrụ iri nile ahụ nke Israel. Isi nile nke 18–20 dekọtara ndụ ezi-omume nke Hezekaia, eze nke Juda, na Onye amụma Aịsaịa. Isi nile nke 21–23 na-ekwu maka ndị eze Manase na Josaia. Dịka ọdị-n’ala, Manase bụ onye ogbugbụ e gburu Aịsaịa n’ihi okwukwe ya dịịrị. Josaịa bụụrụ onye eze ezi-omume, onye hiwegharịrị iwu ahụ ọzọ n’etiti ndị Juu. Isi nile nke 24–25 dekọtara ndọkpụ n’agha ahụ baa Babịlọn.