Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Temple Kirtland


Temple Kirtland

Temple mbụ nke Nzukọ-nsọ wuru n’oge nile nke ọhụrụ. Ndi-nsọ wuru ya na Kirtland, Ohio (United States nke Amerika), dịka inye-iwu nke Onye-nwe siri dị (OznỌd. 94:3–9). Otu nzube bụụrụ inweta ebe ndị otu Nzukọ-nsọ tozuru-oke ga-anata ike nke mụọ, ikike, na igba-ama nye onwe ha (OznỌd. 109; 110). E doro ya nsọ na 27 Maach 1836; ekpere ido-nsọ ahụ ka e nyere Onye-amụma Joseph Smith site na mkpughe (OznỌd. 109). Onye-nwe nyere ọtụtụ mkpughe nile dị mkpa na weghachikwa ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja n’ime temple nke a (OznỌd. 110; 137). E jighi ya mee uju emume-nsọ nile nke temple e nyere n’ime temple nile taa.