Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Joshua


Joshua

Otu onye-amụma Testament Ochie na onye-ndu, na onye nọchiri Moses. A mụrụ ya n’Ijipt tutu ụmụ Israel a gbalaga (Ọnọgụ. 14:26–31). Ya na Keleb nọọrọ n’etiti mmadụ iri na abụọ e dugara inyopụta gbaa-ama Kenean. Nanị ha nyere mkpesa ziri-ezi banyere ala ahụ (Ọnọgụ. 13:8, 17–33; 14:1–10). Ọ nwụrụ mgbe ọ dịịrị afọ 110 (Josh. 24:29). Joshua bụụrụ oke ima-atụ nke onye-amụma ji obi ya nile fee onye-nwe na dike n’agha.

Akwụkwọ nke Joshua

E nyere akwụkwọ a aha Joshua n’ihi na ọ bụ ya bụ onye pụtara ìhè n’ime ya na ọbụghị n’ihi n’ọbụ ya dere ya. Isi nile nke 1–12 na-akọwa nke ọma mmeri n’agha nke Kenean; Isi nile nke 13–24 na-ekwu maka agbụrụ nile nke Israel ikewasị ala ahụ na ndụmọdụ nile ikpe-azụ nke Joshua.

Ama okwu abụọ di n’ime akwụkwọ nke Joshua pụtara ìhè bụ iwu nke Onye-nwe nyere ya ka ọ na-atụgharị uche n’akwụkwọ-nsọ nile (Josh. 1:8) na Ịkpọ-oku nke Joshua kpọrọ ndị mmadụ ka ha kwesị ntụkwasị obi nye Onye-nwe (Josh. 24:15).