Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Zefanaịa


Zefanaịa

Otu onye-amụma Testament Ochie onye biri-ndụ n’oge ọchịchị nke Josaịa (639–608 tutu a mụọ Kraịst).

Akwụkwọ nke Zefanaịa

Isi nke 1 na-ekwu maka otu ụbọchị na-abịa nke ga ejupụta na ọnụma na nsogbu. Isi nke 2 na-adọ ndị Israel aka na ntị ka ha chọọ ezi-omume na ịdị nwayọ. Isi nke 3 na-akọ maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ, mgbe mba nile ga-ezukọta maka agha. Otu-osila-dị Onye-nwe ga-achị eze n’etiti ha.