Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Jona


Jona

Otu onye-amụma Testament Ochie onye nke Onye-nwe kpọrọ ikwusa nchegharị nye ndị nnukwu obodo Nineve (Jona 1:1–2).

Akwụkwọ nke Jona

Otu akwụkwọ di n’ime Testament Ochie nke na-akọ banyere uche e nwetara n’ihe mere na ndụ Jona. Ikekwe Jona edeghị akwụkwọ ahụ n’onwe ya. Uche pụtara ìhè nke akwụkwọ nke Jona bụ na Jehova na-achị ebe nile na ọ dighị akpa-oke site na-idobere otu mba ịhụn’anya ya ma-ọbụ otu ndị.

N’isi nke 1, Onye-nwe kpọrọ Jona ka o kwusaara Nineve ozi-ọma. Kama ime dịka Onye-nwe nyere n’iwu, Jona jiri ụgbọ mmiri gbalaga na otu nnukwu azụ loro ya. N’isi nke 2, Jona kpere ekpere nye Onye-nwe, na azụ ahụ gbọpụtara Jona n’elu ala ọkọrọ. Isi nke 3 dekọtara na Jona gara na Nineve na buo amụma banyere ọdịda ya. Otu o sila dị, ndị mmadụ ahụ chegharịrị. N’isi nke 4, Onye-nwe baara Jona mba n’ihi iwe-iwe na Onye-nwe zọpụtara ndị ahụ.

Jisus kuziri na olulo azụ ahụ loro Jona bụụrụ onyonyo bụ ụzọ nke ọnwụ Jisus n’onwe ya na mbilite n’ọnwụ (Mat. 12:39–40; 16:4; Luk 11:29–30).