Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị Kọrint, Akwụkwọ-ozi e degaara nile


Ndị Kọrint, Akwụkwọ-ozi e degaara nile

Akwụkwọ abụọ ahụ dị n’ime Testament Ọhụrụ. Ha bụbuuru leta nile nke Pọl degaara ndị-nsọ nọ na Kọrint iji mezie adịghị n’usoro n’etiti ha. Ndị Kọrịnt biiri n’ime obodo ndị nwere mụọ ime ihe ọjọọ.

Ndị Kọrint nke mbụ

Isi nke 1 nwere ekele nile nke Pọl na otu ozi nke itụ mma mma. Isi nile nke 2–6 bụ mmezi nile Pọl mezigharịrị iri mpe nile nke ndị-nsọ Kọrịnt. Isi nile nke 7–12 nwere nzaghachi nile nke Pọl nyere ajụjụ ụfọdụ. Isi nile nke 13–15 gbasara afọ-ọma, onyinye nile nke mụọ, na mbilite n’ọnwụ. Isi nke 16 nwere ndụmọdụ Pọl ka e guzo sie ike n’ime okwukwe ahụ.

Ndị Kọrint nke abụọ

Isi nke 1 nwere ekele nile nke Pọl, na otu ozi ịtụ mma mma. Isi nke 2 nwere ndụmọdụ nke onwe maka Taịtọs. Isi nile nke 3–7 na-arụtụ aka n’ike nke ozi-ọma n’ime ndụ nile nke ndị-nsọ na ndị ndu ha nile. Isi nile nke 8–9 na-adụ ndị nsọ nile ọdụ ka ha bụrụ ndị na-eji an̄ụrị na-enye ndị ogbenye onyinye. Isi nile nke 10–12 bụ nkwupụtasi-ike ọnọdụ Pọl dịka Onye-ozi. Isi 13 bụ ịdọ aka na ntị ka e tozuo oke.