Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị Leman


Ndị Leman

Otu ọgbakọ ndị mmadụ n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn nke ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụ ụmụ Leman, nwa-nwoke nke kachasị okenye nke Lihaị. Ha nyochara na Nifaị na ụmụ ụmụ ya mejọrọ ha (Mosa. 10:11–17). Dịka nsonazụ, ha nupuru isi megide ndị Nifaị na ọtụtụ mgbe jụ nkụzi nile nke ozi-ọma. Otu o sila dị, mkpirisi oge tutu ọmụmụ nke Jisus Kraịst, ndị Leman naara ozi-ọma ahụ na bụụrụ ndị ezi-omume karia ndị Nifaị (Hil. 6:34–36). Narị afọ abụọ mgbe Kraịst letasịrị Amerika nile ahụ, ma ndị Leman na ndị Nifaị a bịa bụrụ ndị ajọọ mmadụ na malite ibu-agha megide onye na ibe ya. Gburu-gburu dika 400 mgbe a mụsịrị Kraịst, ndị Leman bibiri mba Nifaị kpam-kpam.