Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mmanụ


Mmanụ

Dịka ọ na-emekarị, ọbụ mmanụ olive ka a na-ekwu mgbe a kpọtụrụ mmanụ n’ime akwụkwọ-nsọ nile. Site n’oge nile nke Testament Ochie, mmanụ olive ka a na-ejirisị n’usoro mmemme nile nke temple na ụlọ-ofufe, maka ite mmanụ nile, maka ịmụ ọkụ nke ọwa-ọkụ nile, na maka ihe oriri. Mmanụ olive na oge ụfọdụ bụ akara maka enweghi ntụpọ na maka Mụọ Nsọ na ike na-arụ ọrụ n’ime ya (1 Sam. 10:1, 6; 16:13; Aịsa. 61:1–3).