Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Luk


Luk

Onye dere Ozi-ọma nke Luk na akwụkwọ nke Ọlụ nile n’ime Testament Ọhụrụ na onye-nso-nso mgbasa ozi-ọma nke Pọl. A mụrụ ya nye nne na nna ndị Grik, na-emekwa ọgwụ (Ndị-Kọl. 4:14). Luk bụụrụ onye nwere ezi ọzụzụ. Ọ kọwara onwe ya dịka onye-nso-nso nye Onye-ozi Pọl mgbe o soro Pọl na Troas (Ọlndoz. 16:10–11). Luk nọ kwa ya na Pọl na Filipai na njem ikpe-azụ Pọl gara ruo Jerusalem (Ọlndoz. 20:6), ma ha abụọ nọkọtara ọnụ ruo na mbịaru ha na Rom. Luk na Pọl nọkwaara na-ịtụ mkpọrọ nke ugboro abụọ ndị Rom tụrụ Pọl (2 Tim. 4:11). Dịka omenala kwuru o nwụrụ dịka onye e gburu n’ihi okwukwe ya.

Ozi-ọma nke Luk

Nkọwasị nke Luk dere banyere Jisus Kraịst na ije-ozị ya n’arụ na-anwụ anwụ. Akwụkwọ nke Ọlụ Ndị-ozi bụ ngan’iru nke Ozi-ọma nke Luk. Luk hapụrụ nkọwasị e deziri e dezi nke ije-ozị Jisus nke na-egosi Jisus dịka Onye-nzọpụta nke ma ndị Juu na ndị Jentaịlụ. O dere ihe dị ukwuu banyere nkuzi nile nke Jisus na omume ya nile. Na Luk ka anyị na-enweta nanị nkọwasị nile nke nleta nile nke Gebriel nye Zakaraịa na Meri (Luk 1); nleta nke ndị ọzụzụ atụrụ nye nwa a mụrụ ọhụrụ Jisus (Luk 2:8–18); Jisus na temple mgbe ọ dị afọ iri na abụọ (Luk 2:41–52); Iri asaa ahụ e nyere ikike na ziga (Luk 10:1–24); Jisus sọrọ ọsụsọ ọbara (Luk 22:44); Mkparịta-ụka nke Jisus na onye-ori n’elu obe (Luk 23:39–43); na Jisus iri azụ na mmanụ an̄ụ mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ (Luk 24:42–43).

Maka otu isi usoro, hụ Ozi-ọma nile.