Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Kwupụta, Nkwupụta


Kwupụta, Nkwupụta

Akwụkwọ nsọ nile na-eji nkwupụta ọ dịkarị a nta n’ụzọ abụọ. N’otu ehiche, ikwupụta bụ ikapụta okwukwe mmadụ n’ihe, dịka ikwupụta na Jisus bụ Kraịst (Mat. 10:32; Ndị-Rom 10:9; 1 Jọn 4:1–3; OznỌd. 88:104).

N’echiche nke ọzọ, ikwụpụta bụ ikwenye ikpe-ọmụma mmadụ, dịka na mkwupụta nke mmehie nile. Ọ bụ ọrụ dịịrị mmadụ ikwupụta mmehie ha nile nye Onye-nwe na nweta mgbaghara (OznỌd. 58:42–43). Mgbe ọ dị mkpa, mmehie nile ka e kwesịrị ikwupụta nye onye ma-ọbụ ndị nile e mehiere megide. Mmehie nile dị mkpa kwesịrị ka ekwupụta ha nye onye ji ọkwa ọrụ na Nzukọ-nsọ (nke kachasị nke, onye ụkọchukwu).