Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Jenesis


Jenesis

Otu okwu Grik pụtara “isi mbido” ma-ọbụ “mmalite” Akwụkwọ nke Jenesis bụ akwụkwọ nke mbụ nke Testament Ochie na onye dere ya bụ onye-amụma Moses. Ọ na-enye nkọwasị nke ọtụtụ mmalite nile, dịka okike nke ụwa, itinye anụmanụ nile, na mmadụ n’elu ụwa, ọdịda nke Adam na Iv, mkpughe nke ozi-ọma ahụ nye Adam, mmalite nke agbụrụ nile na ebo nile, isi mbido ọtụtụ asụsụ nile na Bebel na mmalite nke ezi na ụlọ nke Abraham nke dugara na nhiwe nke ụlọ nke Israel. Ọrụ nke Josef dịka onye nchekwa nke Israel ka ekwusịrị ike na Jenesis.

Mkpughe nke ụbọchị ikpeazụ a nyochara ma mee ka akụkọ ndekọta nke Jenesis doo anya karịa (1 Nif. 5; Ita 1; Moses 1–8; Abr. 1–5).

N’ime akwụkwọ nke Jenesis, isi nile nke 1–4 na-akọ akụkọ okike nke ụwa na ito eto nke ezi na ụlọ nke Adam. Isi nile nke 5–10 dekọtara akụkọ nke Noa. Isi nile nke 11–20 kwuru maka Abraham na ezi na ụlọ ya ga ruo n’oge nke Aịsak. Isi nile nke 21–35 sooro ezi na ụlọ Aịsak. Isi nke 36 kwuru maka Ịsọ na ezi na ụlọ ya. Isi n’ile nke 37–50 kwuru maka ezi na ụlọ Jekọb na na-enye nkọwasị maka orire e rere Josef ga n’Ijipt na ọrụ ya na-izọpụta ụlọ nke Israel.