Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mosaịa, Nwa-nwoke nke Benjamịn


Mosaịa, Nwa-nwoke nke Benjamịn

Otu onye eze ezi-omume Nifaị na onye amụma n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Mosaịa sooro ima-atụ ezi-omume nke nna ya (Mosa. 6:4–7). Ọ tụgharịrị asụsụ nke Iri epekele ọla-edo nile ahụ nke nwere akụkọ ndekọta nke ndị Jared (Mosa. 28:17).

Akwụkwọ nke Mosaịa

Otu akwụkwọ dị n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Isi nile nke 1–6 nwere okwuchukwu jupụtara n’ike nke Benjamịn kwuru nye ndị ya. Muọ nke Onye-nwe metụrụ obi ha nile na ndị mmadụ ahụ ka a gbanwere na ha e nweghị agụụ ime ajọ omume. Isi nile nke 7–8 na-akọ maka otu ọgbakọ ndị Nifaị ndị gaworo-rị ibi n’etiti ndị Leman. E zipụrụ ndị òtù nchọ ahụ ịchọta ha. Ammon, onye-ndu nke òtù nchọ ahụ, chọtara ha na mụta akụkọ nnwale ha nile n’okpuru mmegide ndị Leman. Isi nile nke 9–24 na-akọwa mmegide ahụ nke ọma na otu ndị ndu ha—Zinif, Noa, na Limhai ji bie ndụ n’okpuru ndị Leman. Ogbugbụ n’ihi okwukwe nke e gburu otu onye amụma a kpọrọ Abịnadaị ka e dekọtara. A gbanwere Alma na ikpe ikpe Abịnadaị. Isi nile 25–28 na-akọgharị akụkọ otu nwa-nwoke nke Alma na ụmụ ndịkom anọ nke eze Mosaịa jiri ghọọ ndị a gbanwere. N’isi nke 29 Eze Mosaịa tụpụtara ero nke usoro ndị-ikpe ịnọchi ndị eze. Alma nwa-nwoke nke Alma ka a họpụtara ịbụ onye isi-ikpe nke mbụ.