Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Oriri-nsọ


Oriri-nsọ

Maka Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ, oriri-nsọ na-atụnyere emume nsọ nke iso keta oke nke achịcha na mmiri ahụ na ncheta nke ịchụ aja mgbaghara mmehie nke Kraịst chụrụ. Achịcha ahụ a nyawara na-anọchite anya anụ arụ ya nke a nyawara; mmiri ahụ na-anọchite anya ọbara ahụ nke ọ kwafuru iji chụọ aja mgbaghara mmehie n’ihi mmehie anyị nile (1 Ndị-Kọ 11:23–25; OznỌd. 27:2). Mgbe ndị otu Nzukọ-nsọ tozuru-oke na-anata oriri-nsọ, ha na-ekwe nkwa iwekwasị onwe ha aha nke Kraịst, icheta ya oge nile, na idobe iwu nsọ ya nile. Site n’emume-nsọ nke a, ndị otu Nzukọ-nsọ na-emegharị ọhụrụ ọgbụgba-ndụ baptism ha nile.

Na Nri Anyasị Ikpe-azụ, Jisus kọwara emume-nsọ nke oriri-nsọ ahụ mgbe ya na Ndị-ozi Iri na Abụọ ahụ na-eri ihe (Mat. 26:17–28; Luk 22:1–20).