Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ịbụ-ọnụ, Ịbu ọnụ nile


Ịbụ-ọnụ, Ịbu ọnụ nile

N’ime akwụkwọ-nsọ nile, ọbụbụ-ọnụ bụ itinye iwu dị nsọ n’ọrụ nke na-ekwenye ma-ọbụ na-eweta ikpe nile na ihe nile na-eso ha n’elu ihe, mmadụ, ma-ọbụ ndị mmadụ; na mbụ, n’ihi ime ajọ omume. Ọbụbụ-ọnụ nile bụ ngosipụta ìhè nke ịhụnanya nke Chineke dị nsọ na ikpe ziri-ezi. Chineke nwere ike kpọkuo ha n’onwe ya ma-ọbụ ndị odibo ya o nyere ikike ikwupụta ya. Oge ụfọdụ Chineke nanị na-amata ihe na-eweta ọbụbụ-ọnụ. Tinyekwara, ọnọdụ onye abụrụ ọnụ bụ nke ndị ahụ na-akpachara anya na-enupuru Chineke isi na-enweta mmetụta ya ma si otu ahụ wezuga onwe ha site na mụọ nke Onye-nwe.

Onye-nwe nwere ike iwepụ ọbụbụ ọnụ nile n’ihi okwukwe nke otu onye ma-ọbụ ndị mmadụ n’ime Jisus Kraịst na nrube isi nye iwu nile na emume nsọ nile nke ozi-ọma (Alma 23:16–18; 3 Nif. 2:14–16; Ndep. Ok 1:3).

Nkwutọ

Ịbụ-ọnụ bụ kwa iji asụsụ nke na-ekwutọ, ekwuhie ma-ọbụ na-eleli-anya.