Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Manna


Manna

Otu ihe oriri dịka achịcha dị larịị dị mma nke nwere ụtọ achịcha Wafer mmanụ an̄ụ (Ọpụ. 16:14–31) ma-ọbụ nke mmanụ ọhụrụ (Ọnọgụ. 11:8). Onye-nwe wetara ya iji nyejuo ụmụ Israel afọ n’ime iri-afọ anọ ha n’ime ọzara (Ọpụ. 16:4–5, 14–30, 35; Josh. 5:12; 1 Nif. 17:28).

Ụmụ Israel kpọrọ ya manna (ma-ọbụ “man-hu” n’asụsụ Hibru) nke pụtara “Gịnị ka ọ bụ?”—n’ihi na ha amataghị ihe ọ bụụrụ (Ọpụ. 16:15). A kpọkwara ya “nri ndị mụọ-ozi” na “achịcha si n’elu-igwe” (Abụọma 78:24–25; Jọn 6:31). Ọ bụụrụ akara maka Kraịst, onye ga-abụ Achịcha nke Ndụ (Jọn 6:31–35).