Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Nehemaia


Nehemaia

Otu onye Israel a maara nke ọma na Babịlọn n’ime Testament Ochie (ọ bụ onye Levaị ma-ọbụ site na agbụrụ nke Juda) onye jidere ọkwa nke onye-nkesa ihe on̄un̄ụ na obi-eze Ataksakses, onye o sitere n’aka ya nata ikike nke eze nyere, nke nyere ya ikike ịrụgharị mgbidi nile nke Jerusalem.

Akwụkwọ nke Nehemaịa

Akwụkwọ a bụ iga-n’iru nke akwụkwọ nke Ezra. O nwere nkọwasị nke ịgan’iru na ihe isi-ike omume nile nke ọrụ ahụ na Jerusalem, isochi nlọta-nke ndị Juu site na ndọkpụ n’agha ndị Babịlọn. Isi nile nke 1–7 na-akọ banyere nleta nke mbụ Nehemaia gara na Jerusalem na nrụgharị nke mgbidi nile nke nnukwu obodo ahụ na-agbanyeghị nnukwu mmegide. Isi nile nke 8–10 na-akọwa nke ọma mgbanwe nile nke okpukpere chi na nke obibi ndụ nke Nehemaia gbara mbọ ime ka ọ dịrị. Isi nile nke 11–13 na-enye usoro aha ndị ahụ tozuru oke na na-enye nkọwasị banyere ido mgbidi ahụ nsọ. Ama-okwu nile nke 4–31 nke isi nke 13 dekọtara nleta nke ugboro abụọ nke Nehemaia gara na Jerusalem mgbe ọ nọsịrị afọ iri na abụọ na-eruteghị ebe ahụ.