Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ụmụ ndịkom nke Mosaịa


Ụmụ ndịkom nke Mosaịa

N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, ụmụ ndịkom anọ nke Eze Mosaịa ndị a gbanwere mgbe otu mụọ-ozi pụtakwutere ha na kpọta ha na nchegharị. Aha ha nile bụụrụ Amọn, Erọn, Ọmna, na Himnai (Mosaịa 27:34). Ha nọrọ afọ iri na anọ e nwetara ihe ha chọrọ n’ikwusa ozi-ọma ahụ nye ndị Leman. Otu ndekọta akụkọ nke ije-ozị ha n’etiti ndị Leman ka e nyere n’ime akwụkwọ nke Alma, isi nile nke 17 ruo 26.