Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ihe mere n’oge ndị Eze


Ihe mere n’oge ndị Eze

Akwụkwọ abụọ dị n’ime Testament Ochie. Ha na-enye akụkọ dị mkpirisi banyere ihe nile mere site n’Okike ruo na ịma-ọkwa nke Sairọs ikwenye ndị Juu nile ilọghachite Jerusalem.

Ihe mere n’oge ndị Eze 1

Isi nile nke 1–9 depụtara akụkọ agbụrụ nile site Adam ruo Sọl. Isi 10 dekọtara ihe mere n’ọnwụ Sọl. Isi nile 11–22 leruru anya ịgbaso ihe nile mere eme nke metụtara ọchịchị nke Devid. Isi nile nke 23–27 na-akọwa na e mere Solomon eze ma e doziri ndị Livaị n’usoro. Isi nke 28 na-akọwa na Devid nyere Solomọn Iwu ka o wuo Temple. Isi nke 29 dekotara ọnwụ Devid.

Ihe mere n’oge ndị eze 2

Isi nile nke 1–9 na-eleru anya iso ihe nile mere eme metụtara Ọchịchị Solomọn. Isi nile nke 10–12 na-ekwu maka ọchịchị Rehoboam nwa-nwoke nke Solomọn, n’oge nke e kewasịrị ala-eze e jikọrọ ọnụ nke Israel ịbụ ala-eze nile nke mpaghara elu-elu na nke ndịda. Isi nile nke 13–36 na-akọwa nke ọma ọchịchị nile nke ndị eze dị iche iche bịa ruo na-ịdọkpụ n’agha nke ala-eze nke Juda site n’aka Nebukadneza. Akwụkwọ ahụ gwụchara jiri iwu-ọkụ nke Sairọs nyere na ụmụ Juda nile nwere ike ịlọghachi na Jerusalem.