Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Betel


Betel

Na Hibru, Ọ pụtara “ụlọ nke Chineke” ọ bụ kwa otu n’ime ebe kachasị ịdị nsọ n’Israel. Ọ dị ihe dịka kilomita iri na isii na Ugwu Jerusalem. Ebea ka Abraham wuru ebe ịchụ-aja ya n’oge Ọ bịaruru Kenean na mbụ (Jen. 12:8; 13:3). Ebe a Jekọb hụrụ n’ọhụ otu ububu na-eguzo ruo n’ime elu-igwe (Jen. 28:10–19). Ọ bụ kwa ebe dị nsọ n’ụbọchị nile nke Samuel (1 Sam. 7:16; 10:3).