Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Amen


Amen

Ọ pụtara “ka Ọ dị otu a” ma-ọbụ “Otu a ka Ọ dị.” A na ekwu amen izipụta nmetụta n’obi ma-ọbụ nnabata dị mkpa na nkwekọrịta (Deut. 27:14–26) ma-ọbụ ezi-okwu (1 Ndez. 1:36). N’ụbọchị taa na ngwụcha ekpere nile, igba-ama nile na ikwu okwu nile, ndị ahụ nụrụ ekpere ahụ ma-ọbụ ozi ahụ na-ekwu amen otu a ga-anụ ya izipụta nkwekọrịta na nnabata.

N’oge nile nke Testament Ochie, mmadụ ga-ekwu amen mgbe ọ na-an̄ụ iyi (1 Ihem. 16:7, 35–36; Neh. 5:13; 8:2–6). Kraịst ka a kpọrọ “Amen ahụ na ezi onye aka-ebe kwesịrị ntụkwasị-obi” (Mkpu. 3:14). Amen rụkwara-ọrụ dịka ihe aka-ebe nke ọgbụgba-ndụ n’ime Ụlọ-akwụkwọ nke ndị amụma (OznỌd. 88:133–135).