Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Agwọ Ọla bras


Agwọ Ọla bras

Otu agwọ ọla bras nke Moses mere na-inye iwu nke Chineke maka ịgwọ ndị Israel ndị agwọ nile yiri ọkụ (agwọ nile jupụtara na nsi) tara n’ime ọzara (Ọnọgụ. 21:8–9). Agwọ ọla bras a ka e kedoro n’otu osisi “bulie kwa elu ka onye ọbụla ga-elekwasị ya anya nwee ike dị ndụ” (Alma 33:19–22). Onye-nwe tụnyere mbulite n’elu nke agwọ ahụ n’ime ọzara dịka otu àkàrá nke onwe ya ebe ebuliri ya elu n’elu obe (Jọn 3:14–15). Mkpughe ụbọchị-ikpeazụ mesịrị nkọwasị nke agwọ nile yiri ọkụ ike na otu e si gwọọ ndị mmadụ ahụ (1 Nif. 17:41; 2 Nif. 25:20; Hil. 8:14–15).