Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mak


Mak

N’ime Testament Ọhụrụ, Jọn Mak bụụrụ nwa-nwoke nke Meri, onye biiri na Jerusalem (Ọlndoz. 12:12); O nwekwara ike bụrụ na ọ bụụrụ nwa nwanne (ma-ọbụ nwa nwanna) nke Banabas (Ndị-Kọl. 4:10). O sonyere Pọl na Banabas na njem mgbasa ozi-ọma nke mbụ ha site na Jerusalem, ma hapụ ha na Paga (Ọlndoz. 12:25; 13:5, 13). N’ikpe-azụ o sonyere Banabas ga Saịprọs (Ọlndoz. 15:37–39). Ya na Pọl nọọrọ na Rom (Ndị-Kọl. 4:10; Fai. 1:24); ma Ya na Pịta nọkwaara na Babịlọn (ikekwa na Rom) (1 Pita 5:13). Na ngwụcha, ya na Timoti nọọrọ na Efesos (2 Tim. 4:11).

Ozi-ọma nke Mak

Akwụkwọ nke abụọ n’ime Testament Ọhụrụ. Ozi-ọma Mak kwere omume na-e dere ya n’okpuru nduzi ụzọ nke Pịta. Ebum n’obi ya bụ ịkọwa Onye-nwe nke ọma dịka Ọkpara nke Chineke, onye biri ndụ na na-eme omume n’etiti ndị mmadụ. Mak jiri ume na idi umeala na-akọwa nke ọma, ihe idị n’uche nke Jisus mere ka ọdị n’arụ ndị na-ege ya ntị. Dịka omenala na-ekwụ na mgbe Pịta nwụsịrị, Mak letara Ijipt, hazie Nzukọ-nsọ na Aleksandrịa, ma nwụọ site na ogbugbụ n’ihi Okwukwe ya.

Maka otu isi usoro, hụ Ozi-ọma nile.