Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndepụta n’usoro a bụ ụdịị nke Isi-ọkwu nịịle


Ndepụta n’usoro a bụ ụdịị nke Isi-ọkwu nịịle

Otu e si eji ya. Nduzi gaa na Akwụkwọ-nsọ nile bụ ndepụta n’usoro a bịị dịị nke isi-ọkwu nile nke ozi-ọma. Ọ na-enye mkpirisi nkọwa nke isi-ọkwu ọbụla na na-enye ntụnyere dịkachasị mkpa nke akwụkwọ-nsọ nile banyere isi-ọkwu nke ahụ. Mkpirisi nn̄omi ma-ọbụ nchịkọta okwu nke akwụkwọ-nsọ na-ebu ntụnyere ọbụla ụzọ. Ntunyere nke akwụkwọ-nsọ ahụ na-apụta ihe n’usoro nke a na-eso: Testament Ochie, Testament Ọhụrụ, Akwụkwọ nke Mọmọn, Ozizi na

Foto, oyiyi
Ihe ngosi

Abraham

Nwa-nwoke nke Tira, amụrụ na Ua nke ndị Kaldịa (Jen. 11:26, 31; 17:5). Onye-amụma nke Onye-nwe nke ya na Onye-nwe mere ọgbụgba-ndụ nile ebighi-ebi, nke esitere na ya gọzie mba nile nke ụwa. Aha akpọbuuru Abraham bụ Abram.

Akwụkwọ nke Abraham

Akụkọ ndekọta nile agba ochie nke Abraham dere nke batara n’aka nke Nzukọ-Nsọ na 1835. Akụkọ ndekọta ahụ nile na ụfọdụ anụ arụ ndị mmadụ e chekpọrọ echekpọ ka Antonio Lebolo chọpụtara na Ijipt n’ime ili nile dị n’okpuru ala, onye jiri mmasị ya mgbe ọ nwụrụ nye ya Michael Chandler. Chandler gosipụtara ha na United States n’afọ 1835. Ụfọdụ ndị enyi Joseph Smith zụtara ha site n’aka Chandler ma nye ha Onye-amụma, onye tụgharịrị asụsụ ha. Ụfọdụ n’ime akụkọ ndekọta ndị a ka a ga-achọta n’ime Ọla Pel nke Oke Ọnụ-ahịa.

Isi nke 1 dekọtara ihe nile Abraham gabigara na Ua nke ndị Kaldia, ebe ndị ajọ nchụ-aja gbara mbọ iji ya chụọ aja. Isi nke 2 na-ekwu maka ije njem ya gaa n’obodo Kenean. Onye-nwe pụtara ìhè nye ya ma ya na ya e mee ọgbụgba-ndụ. Isi nke 3 dekọtara na Abraham hụrụ ụwa nile na mara maka mmekọrịta nile dị n’etiti ihe nile nke elu-igwe. Isi nile nke 4–5 bụ nkọwasị nke okike.

Agbụrụ Iri

Agbụrụ Iri na-abụọ nke Israel

Isi-ọkwu nile di n’obodobo, mkpụrụ-okwu nke elu.

E nwere nke-nke nkọwa nke isi-ọkwu ọbụla.

Isi-ọkwu ụfọdụ nwere ndedata nile nke okpuru. Ndị a dị n’ụdị aka-àkwụkwọ pụrụ iche.

Ntụnye nile nke akwụkwọ-nsọ nke na-enyere gị aka ịghọta nkọwa ahụ dị na akara mkpuchi.

Oge ụfọdụ ozi banyere otu isi-ọkwu bụ nke na-etinyeghị n’okpuru isi-ọkwu ahụ nke i leworo. Okwu ahụ di n’ụdị aka-akwụkwọ pụrụ iche hụ na-eduzi gị ụzọ nye isi-ọkwu ahụ ebe a chọtara ozi ahụ.

Oge ụfọdụ isi-ọkwu ndị ọzọ dị n’ime Nduzi ahụ nwere ozi nke metụtara isi-ọkwu ahụ ị na-amụ maka ya. Okwu nile ahụ dị n’ụdị aka-akwụkwọ pụrụ iche hụ kwa na-eduzi gị ụzọ nye isi-ọkwu nile ndị a metụtara ibe ha.

Nkpirisi nụomi ma-ọbụ nchịkọta okwu nke akwụkwọ-nsọ na-ebu ntụnye ọbụla ụzọ.

Ntụnye nile nke akwụkwọ-nsọ ndị metụtara ibe ha ka a na-enye na akara mkpuchi.

Okwu ahụ dị n’ụdị aka akwụkwọ pụrụ iche hụ (ma-ọbụ hụ kwa) nke akara nke a — na-eso na-agwa gị na ozi ahụ ka a chọtara na ndedata nke okpuru (“Agbụrụ iri na abụọ nke Israel”) nke isi-ọkwu ya n’onwe ya (“Israel”).