Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mkpụrụ-obi


Mkpụrụ-obi

Akwụkwọ-nsọ na-ekwu maka mkpụrụ obi n’ụzọ atọ: (1) ndị mụọ, ma tutu e nwee anụ arụ na mgbe e nwesịrị anụ arụ (Alma 40:11–14; Abr. 3:23); (2) otu mụọ na otu arụ e jikọtara n’ime ịnwụ anwụ (Abr. 5:7); na (3) onye na-anaghị anwụ anwụ biliteworo n’ọnwụ onye mụọ na arụ ya na-ejikọtawo na-enweghị nkewa ọzọ (Alma 40:23; OznỌd. 88:15–16).

Ọnụ-ahịa nke mkpụrụ-obi nile

Mmadụ dum bụ ụmụ nke Chineke na mụọ. Ọ na-eleba anya banyere otu n’ime ụmụ ya ọbụla ma na-atule otu nke ọbụla na ọ dị mkpa. N’ihi na ha bụ ụmụ ya, ha nwere ike ịbịa dịrị ka ya. Ya mere, ha dị ukwuu n’ọnụ ahịa.