Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Emọs


Emọs

Otu onye-amụma nke Testament Ochie, onye buru amụma site ihe dịka afọ 792 ruo 740 tutu amụọ Kraịst n’ụbọchị nile nke Uzaia, eze nke Juda, na Jeroboam, eze nke Israel.

Akwụkwọ nke Emọs

Akwụkwọ dị n’ime Testament Ochie. Ọtụtụ n’ime amụma nile Emọs buru na-adụ Israel na mba nile ndị agbata-obi ya ọdụ, ka ha lọghachi n’ezi-omume.

Isi nile nke 1–5 na-akpọ Israel na mba ndị agbata-obi ya ka ha chegharịa. Isi nke 3 na-akọwa na Onye-nwe na-ekpughe izu nzuzo ya nile nye ndị amụma ya, na n’ihi njehie, onye-iro ga-ebibi Israel. Isi nile nke 6–8 na-ebu amụma ọdịda nke Israel ọtụtụ afọ tutu ndị Asiria abakpo ha n’agha. Isi nke 9 na-ebu amụma na a ga-eweghachi Israel n’ala nke aka ya.