Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Hosana


Hosana

Okwu si na Hibru nke pụtara “biko zọpụta anyị” ma a na-eji ya na-ija mma na ikpe ekpere.

Na Oriri nke “ulo ofufe” ụmụ Israel, nke bụ mmemme nnapụta nke Israel baa na ala ekwere na nkwa, ndị mmadụ gụrụ okwu nile nke Abụọma 118 na fegharịa alaka igu nkwụ nile. Na mbata mmeri nke Onye-nwe batara n’ime Jerusalem, igwe mmadụ nile ahụ tiri “Hosana” na gbasaa alaka igu nkwụ n’ala ka Jisus rigofee n’elu ya, si otua gosi nghọta ha na Jisus bụụrụ otu Onye-nwe ahụ nke napụtara Israel na mgbe Ochie (Abụọma 118:25–26; Mat. 21:9, 15; Mak 11:9–10; Jọn 12:13). Ndị mmadụ a matara Kraịst dịka Mesaia ahụ a na-eche ogologo oge. Okwu ahụ Hosana a bụrụla mmemme nke Mesaia ahụ n’ọgbọ nile (1 Nif. 11:6; 3 Nif. 11:14–17). Iti mkpu Hosana ahụ ka e tinyere na ido-nsọ nke Temple di na Kirtland (OznỌd. 109:79) na ugbua ọ bụrụla mpaghara nke ido-nsọ nke Temple nile nke agba ọhụrụ.