Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Damaskọs


Damaskọs

Otu nnukwu obodo mgbe ochie na Siria.

Damaskọs guzo n’elu mbara ala na-erupụta ihe akụkụ ubi nke ọma n’agiga ọzara ma na-enweta mmiri na-ede n’ala ahụ nke ọma site na osimiri Berada. A kpọtụrụ ya aha kwa mgbe kwa mgbe n’ime akwụkwọ nsọ nile (malite na Jen. 15:2). Pọl nọ n’ụzọ ya ịga Damaskọs mgbe Onye-nwe, onye biliworo n’ọnwụ pụtara ìhè nye ya (Ọlndoz. 9:1–27; 22:5–16; 26:12–20; 2 Ndị-Kọ 11:32–33).