Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Isaka


Isaka

Otu nwa-nwoke nke Jekọb na Lia, n’ime Testament Ochie (Jen. 30:17–18; 35:23; 46:13). Ụmụ-ụmụ ya bịara bụrụ otu n’ime agbụrụ iri na abụọ nke Israel.

Agbụrụ nke Isaka

Ngọzi nile Jekọb nyere Isaka ka a ga-achọta na Jenesis 49:14–15. Mgbe ha bisịrị na Kenean, agbụrụ ahụ natara ụfọdụ n’ime ala nke Palestain nke kachasị ịba ụba, tinyere mbara ala nke Esdrelọn. E nwere ọtụtụ ebe nile dị mkpa n’akụkọ ndị Juu n’ime oke-ala Isaka, ịma-atụ, Kamel, Megido, Dotan, Gilboa, Jezril, Teboa, na Nazaret (Josh. 19:17–23).