Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ijipt


Ijipt

Otu ala dị n’agịga mpaghara Elu-elu Ọwuwa anyanwụ nke Afrika. Ebe buru ibu na Ijipt e nweghị ike imita mkpụrụ ihe okuku na tọgbọrọ n’efu. Ndị bi na ya kachasị biri n’ime ndagwurugwu Nailu, nke gbatịrị ruo ọdịka nari kilomita asatọ na iri itolu.

Ijipt nke agba Ochie bara ọgaranya, na-eme nke ọma. Nnukwu ọrụ nile nke obodo ka ndị Ijipt wuru, tinyere ọwa mmiri nile ndị ha wuru maka igba mmiri n’ubi, nnukwu obodo nile siri ike maka mgbochi, na ihe ncheta ndị eze nile, nke ka nke ili piramid nile na temple nile, ihe ndị a nile ka so kwa n’etiti ihe ebube nile nke ụwa. Maka otu oge, ochichi nke Ijipt buuru mgbaso usoro nke ọkwa nchụ—aja nke onye isi ezi na ulo (Abr. 1:21–27).