Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Mbilite n’ọnwụ


Mbilite n’ọnwụ

Ijikọtaghachị arụ nke mụọ na arụ nke anụ arụ na ọkpụkpụ nile mgbe a nwụsịrị ọnwụ. Mgbe mbilite n’ọnwụ gasịrị, mụọ ahụ na arụ ahụ a gaghị agbasasị ọzọ, ma onye ahụ ga-aghọ anụ arụ na-anaghị anwụ anwụ. Onye ọbụla a mụrụ n’elu ụwa ga-ebili n’ọnwụ n’ihi na Jisus Kraịst meriri ọnwụ (1 Ndị-Kọ 15:20–22).

Jisus Kraịst bụụrụ onye mbụ e bilitere site n’ọnwa n’elu ụwa nke a (Ọlndoz. 26:23; Ndị-Kọl. 1:18; Mkpu. 1:5). Testament Ọhụrụ na-enye aka-ebe pụtara-ìhè na Jisus bilitere jiri arụ nke a na-ahụ anya; ili ya tọgbọ n’efu, o riri azụ na mmanụ an̄ụ, o nweere arụ nke anụ arụ na ọkpụkpọ nile, ndị mmadụ bituru ya aka, ma ndị mụọ-ozi kwuru na o biliwo (Mak 16:1–6; Luk 24:1–12, 36–43; Jọn 20:1–18). Mkpughe ụbọchị ikpeazụ na-emesi-ike ezi-okwu nke mbilite n’ọnwụ nke Kraịst na nke mmadụ nile (Alma 11:40–45; 40; 3 Nif. 11:1–17; OznỌd. 76; Moses 7:62).

A gaghị ebilite mmadụ nile n’ọnwụ baa n’otu ụdị ebube (1 Ndị-Kọ 15:39–42; OznỌd. 76:89–98), ma-ọbụghị na a ga-ebilite mmadụ nile n’otu oge ahụ (1 Ndị-Kọ 15:22–23; Alma 40:8; OznỌd. 76:64–65, 85). Ọtụtụ Ndị-nsọ ka e bilitere mgbe mbilite n’ọnwụ Kraịst gasịworo (Mat. 27:52). A ga-ebilite ndị ezi-omume na mbilite n’ọnwụ nke mbụ tutu ndị ajọọ omume apụta site n’ili (1 Ndị-Tes. 4:16); Ndị mmehie na-enweghị nchegharị ga apụta na mbilite n’ọnwụ nke ikpe-azụ Mkpu. 20:5–13; OznỌd. 76:85).