Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Nifaị, Nwa-nwoke nke Nifaị, Nwa-nwoke nke Hilaman


Nifaị, Nwa-nwoke nke Nifaị, Nwa-nwoke nke Hilaman

Otu n’ìme ndị na-eso ụzọ iri na Abụọ ahụ nke Jisus Kraịst ahụ biliteworo n’ọnwụ họọrọ n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn (3 Nif. 1:2–3; 19:4). Onye amụma a kpere nnukwu ekpere nye Onye-nwe n’aha ndị ya. Nifaị wee nụrụ olu nke Onye-nwe (3 Nif. 1:11–14). Ndị Mụọ-ozi letakwara Nifaị, ọ chụpụkwara ajọọ mụọ nile, o kulitere nwanne ya nwoke site na ndị nwụrụ anwụ, na ọ gbara-ama nke na a gaghị ajụ ikwere na ya (3 Nif. 7:15–19; 19:4). Nifaị dobere akụkọ ndekọta nke akwụkwọ-nsọ (3 Nif. 1:2–3).

Akwụkwọ nke 3 Nifaị

Otu akwụkwọ nke Nifaị nwa-nwoke nke Nifaị dere, n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Isi nile nke 1–10 na-egosi mmejupụta nke ibu amụma nile banyere ọbịbịa nke Onye-nwe. Ihe iriba-ama nke ọmụmụ Kraịst ka e nyere; ndị mmadụ ahụ chegharịrị, mana mgbe ahụ ha lọghachiri na ajọọ omume. N’ikpeazụ oke ebili mmiri nile, ala ọma jijiji nile, oke ikuku dị ike, na nnukwu mbibi bụ ntụaka ọnwụ nke Kraịst. Isi nile nke 11–28 dekọtara ọbịbịa Kraịst nye ndị Amerika. Nke a bụ mpaghara nke etiti nke akwụkwọ nke 3 Nifaị. Ọtụtụ n’ime okwu nile nke Kraịst na okwu-chukwu ya nile e dekọtara n’ime Bible yiri (iji maa atụ Mat. 5–7 na 3 Nif. 12–14). Isi nile nke 29–30 bụ okwu nile nke Mọmọn nye mba ndị ụbọchị ikpe-azụ.

Akwụkwọ nke 4 Nifaị

Akwụkwọ nke a nwere narị ama-okwu iri anọ na itoolu, ha nile n’otu isi, mana o kpuchitere ihe fọdụrụ obere ka ọ bụrụ narị afọ atọ nke akụkọ Nifaị (34–321 mgbe a mụsịrị Kraịst). Ọtụtụ, ọgbọ ndị ode akwụkwọ nile, tinyere Nifaị soro nye aka na akụkọ ndekọta ahụ. Ama-okwu nile nke 1–19 na-akọ na mgbe Kraịst nke biliworo n’ọnwụ letasịrị ha ndị Nifaị nile na ndị Leman nile bụụrụ ndị a gbanwere nye ozi-ọma ahụ. Udo, ịhụnanya na nkwekọrịta chịrị. Ndị na-eso ụzọ Nifaị atọ ahụ bụ ndị Kraịst kwenyere ka ha fọdụ n’elu ụwa ruo n’ọbịbịa ya nke ugboro abụọ (3 Nif. 28:4–9), kwusara ozi-ọma nye ndị mmadụ ahụ. Nifaị hapụụrụ nwa ya nwoke Emọs akụkọ ndekọta ahụ. Ama-okwu nile nke 19–47 bụ akụkọ ndekọta nke nkwusa-ozi ọma nke Emọs (Afọ nile dị 84) na nke ahụ bụ nke nwa ya nwoke Emọs (afọ nile dị 112). N’afọ 201 mgbe a mụsịrị Kraịst, mpako malitere ịkpata nsogbu nile n’etiti ndị ahụ, ndị kewasịrị onwe ha n’ogo nile na malite nzukọ ụgha nile iji nweta uru (4 Nif. 1:24–34).

Ama-okwu nile ndị ikpe-azụ na-egosi na ndị mmadụ ahụ lọghachikwara azụ ọzọ n’ajọọ omume (4 Nif. 1:35–49). N’afọ 305 mgbe a mụsịrị Kraịst; Emọs nwa-nwoke nke Emọs nwụrụ ma nwanne ya nwoke Amarọn zoro akụkọ ndekọta ahụ nile dị nsọ maka ichekwa ha. Amarọn n’ikpe-azụ ranyere akụkọ ndekọta ahụ n’aka Mọmọn, onye dekọtara otụtụ ihe nile mere n’oge ndụ ya na mgbe ahụ mee ha na mkpirisi (Mọm. 1:2–4).