Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị Samerịa


Ndị Samerịa

Ndị mmadụ nke Bible ahụ ndị biiri na Samerịa mgbe ndị Asirịa dọkpụsịrị ala-eze mpaghara elu elu nke Israel n’agha. Ndị Samerịa bụụrụ ụfọdụ ndị Israel na ụfọdụ Jentaịlụ. Okpukpe-chi ha bụụrụ ngwakọta nke ndị Juu na arụsị n’okwukwe nile na omume nile. Akụkọ ilu ahụ nke ezi onye Samerịa n’ime Luk 10:25–37 gosiri ịkpọ-asị nke ndị Juu na-enweela maka ndị Samerịa n’ihi na ndị Samerịa adapụworị site n’okpukpe-chi nke ndị Israel. Onye-nwe tụziiri Ndị-Ozi aka ka ha kuziere ndị Samerịa ozi-ọma ahụ (Ọlndoz. 1:6–8). Filip mere nke ọma kwusaara ndị Samerịa ozi-ọma nke Kraịst na rụkwara ọtụtụ ọrụ-ebube n’etiti ha (Ọlndoz. 8:5–39).