Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ọbara


Ọbara

Ndị Israel agba ochie na ọtụtụ ọdịnala nile taa na-ele ya anya dịka ọnọdụ nke ndụ ma-ọbụ ume dị oke mkpa nke anụ arụ nile. N’oge nile nke Testament Ochie Onye-nwe gbochiri Israel iri ọbara dịka nri (Lev. 3:17; 7:26–27; 17:10–14).

Ike mgbaghara nke ichụ-aja dị n’ime ọbara, n’ihi na e weere ọbara dịka ihe dị oke mkpa nye ndụ. Iji anụmanụ achụ-aja bụụrụ oyiyi nke oke aja ahụ Jisus Kraịst chụrụ n’ikpe-azụ (Lev. 17:11; Moses 5:5–7). Ọbara aja mgbaghara mmehie nke Jisus Kraịst na-asachapụ onye na-echegharị site na mmehie (1 Jọn 1:7).