Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ụlọ-nzukọ


Ụlọ-nzukọ

Ebe nzukọta e jiiri mee ihe nile maka okpukpe-chi. N’ime oge nile Testament Ọhụrụ, arịa ụlọ ahụ n’ọha dịịrị mfe, nwere otu igbe nke iwu a fụrụ afụ na edemede ndị ozo dị nsọ, otu oche a na-anọdụ agụpụta akwụkwọ, na oche nile maka ndị na-efe ofufe.

Otu Kansụl nke ndị okenye mpaghara nta lekọtara ụlọ-nzukọ ọbụla. Ha kpebiri onye a ga-akpọbata na onye a ga-ahapụ (Jọn 9:22; 12:42). Onye kachasị ịdị mkpa n’ọkwa ọrụ bụụrụ onye na-achị ụlọ-nzukọ ahụ (Luk 13:14; Mak 5:22). N’ọha ọ bụụrụ onye ode akwụkwọ, na-elekọtabu ụlọ ahụ, na lekota kwara ije-ozị ya nile. Onye inye-aka rụrụ ọrụ ndekọta nile (Luk 4:20).

Enwere otu ụlọ-nzukọ n’obodo ọbụla ndị Juu naara ebi, ma n’ime Palaestaịn na ebe ndị ọzọ nile. Nke a bụụrụ enyem-aka dị ukwuu na-ịgbasa ozi-ọma nke Jisus Kraịst n’ihi na ndị mgbasa-ozi-ọma gboo nke Nzukọ-nsọ ahụ nwere ike ikwu okwu n’ime ụlọ-nzukọ ahụ nile (Ọlndoz. 13:5, 14; 14:1; 17:1, 10; 18:4). Otu ụdị omume a dịịrị n’etiti ndị mgbasa ozi-ọma n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn (Alma 16:13; 21:4–5; 32:1), ya na kwa n’etiti ndị mgbasa ozi-ọma gboo nke ọgbọ nke a (OznỌd. 66:7; 68:1).