Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ita


Ita

Onye-amụma ikpe-azụ Jared n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn (Ita 12:1–2).

Akwụkwọ nke Ita

Otu akwụkwọ n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn nke nwere ụfọdụ akụkụ nile nke akụkọ ndekọta ndị Jared. Ndị Jared bụụrụ otu ọgbakọ ndị mmadụ ndị bibuuru na mpaghara Ọdịda-anyanwụ nke ụwa ọtụtụ nari narị afọ nile tutu ndị nke Lihai. Akwụkwọ nke Ita ka e wetara site n’epekele dị iri abụọ na anọ nke ndị Limhai chọtara (Mosa. 8:8–9).

Isi nile nke 1–2 na-akọ otu ndị Jared si hapụ ala ha n’oge nke ụlọ-elu tọwa nke Babel, na malite njem ha gawa n’ebe a matara ugbua dịka Kọntinenti nke Amerika. Isi nile nke 3–6 na-akọwa na nwanne nwoke nke Jared hụrụ Onye-nzọpụta mgbe ndụ na-enweghi anụ arụ; ma na ndị Jared jere njem ha n’ime ụgbọ mmiri asatọ. Isi nile nke 7–11 gara n’iru n’akụkọ ihe ọjọọ nke weere ọnọdụ karịchaa n’ime akụkọ nke ndị Jared. Moronaị onye lebara anya n’akụkọ ndekọta Ita, dere n’isi nile nke 11–12, banyere ihe ebube nile nke okwukwe mere na banyere Kraịst na Jerusalem ọhụrụ nke ga-abịa. Isi nile 14–15 na-akọ otu ndị Jared jiri ghọọ nnukwu mba, mana ebibiri ha site n’agha nke ime obodo n’ihi ime ihe ọjọọ.