Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Deuteronọmị


Deuteronọmị

Putara “mmeghari nke iwu” na bụkwa akwụkwọ nke ise nke Testament Ochie.

Deuterọnọmi nwere okwu atọ nile ikpe-azụ nke Moses nke o nyefere na mbara larịị ala nile nke Moab nanị tutu e nwogharịa ya. Okwu nke mbụ (Isi nile nke 1–4) bụ ime ka a mata-isi okwu. Okwu nke abụọ (Isi nile 5–26) nwere mpaghara abụọ mejupụtara ya: (1) Isi nile 5–11—Iwu-nsọ Iri nile na nkọwa ha na-omume ha; na (2) Isi nile 12–26 bụ ọtụtụ Iwu e doro n’usoro nke mejupụtara ọnọdụ etiti nke akwụkwọ ahụ nile. Okwu nke atọ (Isi nile nke 27–30) nwere mmegharị dị mkpa nke Ọgbụgba-ndụ ahụ n’etiti Israel na Chineke na ima-ọkwa nke ngọzi nile na-eso nrube-isi nile na ịbụ ọnụ na-eso erubeghị-isi. Isi nile nke 31–34 na-akọwa nke ọma nnyefe iwu ahụ n’aka ndị Livaị, abụ Moses, na ngọzi ikpe-azụ na ụla nke Moses.