Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Tomas


Tomas

N’ime Testament Ọhụrụ otu n’ime Ndị-ozi Iri na Abụọ izizi nke Onye-nzọpụta họọrọ n’oge ije-ozị ya n’arụ na-anwụ anwụ. Na Grik aha ahụ bụ Didimọs (Mat. 10:2–3; Jọn 14:5; 20:24–29; 21:2). Na-agbanyeghị na Tomas nwere obi abụọ banyere mbilite n’ọnwụ nke Jisus ruo mgbe ọ hụrụ Onye-nzọpụta ahụ n’onwe ya, ịdị ike nke agwa ya mere ya ịdị na njikere ịnagide mkpagbu na ọnwụ, ya na Onye-nwe ya (Jọn 11:16; 20:19–25).