Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ụmụ ndịkom nke ịla-n’iyi


Ụmụ ndịkom nke ịla-n’iyi

Ndị na-eso Setan ndị ha na ya ga-ata ahụhụ ebighi-ebi. Ụmụ ndịkom nke Ịla n’iyi gụnyere (1) Ndị ahụ sooro Setan a chụpụkwara site n’elu-igwe n’ihi nnupụ-isi n’oge ndụ a na-adị tutu e nwee anụ arụ, na (2) Ndị ahụ e kwenyere ka a mụbata n’ụwa nke a jiri arụ nke anụ arụ kama ha fere Setan ofufe ma tụgharịa kpam kpam megide Chineke. Ndị ahụ nọ n’ime òtù nke abụọ nke a ka a ga-ebilite site na ndị nwụrụ anwụ kama a gaghị agbapụta ha site na ọnwụ nke mụọ nke ugboro abụọ ma ha enweghị ike ibi n’ime ala-eze nke ebube (OznỌd. 88:32, 35).