Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Eklisiastis


Eklisiastis

Otu akwụkwọ n’ime Testament Ochie, nwere ntụgharị-uche nile n’elu mkpa ụfọdụ nke ndụ dikachasịrị omimi.

Onye dere akwụkwọ ahụ, onye-nkwusa okwu-Chukwu, dere nke dị ukwuu n’akwụkwọ ahụ site n’ọnọdụ uche nke ndị ahụ na-enweghị nghọta nke ozi-ọma. O dere dika mmetụta nile nke ndị ụwa siri dị—nke bụ, ndị ahụ “nọ n’okpuru anyanwụ” (Ekl. 1:9). Nke dị ukwuu na akwụkwọ ahụ na-egosi ekweghị-ekwe na inwe ajọ olile-anya (Ekl. 9:5, 10). Nke a abụghị otu Onye-nwe ga-achọ ka anyị ghọta ndụ kama otu onye-nkwusa okwu-chukwu siri hụta ka ihe nile siri pụta ìhè nye ndị na-enweghị mmụta n’ụwa. Mpaghara kachasị ịbụ nke mụọ n’akwụkwọ ahụ dị na isi nile nke 11 na 12, ebe onye dere ya mechiri na nanị ihe bara uru na-adigide bụ irube-isi nye iwu nsọ nile nke Chineke.