Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Inọs, Nwa-nwoke nke Jekọb


Inọs, Nwa-nwoke nke Jekọb

Otu onye-amụma ndị Nifaị na onye na-edobe akwụkwọ ndekọta n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, onye kpere ekpere maka na nweta kwa nsachapụ mmehie ya nile site n’okwukwe na Kraịst (Inọs 1:1–8). Onye-nwe mere ọgbụgba-ndụ ya na Inos iwegara ndị Leman Akwụkwọ nke Mọmọn (Inọs 1:15–17).

Akwụkwọ nke Inọs

Otu akwụkwọ di n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn nke na-akọ maka ekpere Inọs kpere nye Onye-nwe maka mgbaghara nke onwe ya, na nke ndị ya, na maka ndị ọzọ. Onye-nwe kwere ya nkwa na ọ ga-e chekwa Akwụkwọ nke Mọmọn na mee ka o rute ndị Leman n’ụbọchị ọdị n’iru. Na-agbanyeghị na-akwụkwọ ahụ nwere nanị otu isi okwu, o dekọtara akụkọ nwere ikike nke otu nwoke chọsiri Chineke ya ike n’ekpere, bie ndụ nrube isi nye iwu-nsọ nile Chineke, na tutu ya anwụọ ọ n̄ụrịrị on̄u n’ime mmụta ya banyere onye mgbapụta ahụ.