Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ima ọkwa nke ụlọ-ọrụ—2


Ima ọkwa nke ụlọ-ọrụ—2

Otu nkwupụta nke Ozizi gbasara ndị ga-ejide Ọkwa nchụ-aja nke Chineke, nke e bipụtara n’ibe akwụkwọ ndị ikpe-azụ nke Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile. Na mmalite Jun 1978. Onye-nwe kpugheere Onye-isi nduzi Spencer W. Kimball na e kwesịrị ka e nye ndị nwoke nile tozuru oke nke Nzukọ-nsọ Ọkwa nchụ-aja ahụ. Nke a mere ka Ọkwa Nchụ-aja dịrị ndị nwoke nile tozuru-oke na ngọzi nile nke temple dịrị ndị otu nile tozuru oke nke Nzukọ-nsọ, na-atụleghị agbụrụ ma-ọbụ ọcha elu arụ. Na 30 Septemba 1978, e wepụtara Ima-Ọkwa nke a nye ọgbakọ ntụgharịkọta uche zuru ọha nke Nzukọ-nsọ, na e jiri otu olu nabata ya.