Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Job


Job

N’ime Testament Ochie, otu nwoke ezi-omume onye tara ahụhụ mkpagbu dị ukwuu, mana ọ nọgidere n’ikwesị ntụkwasị-obi na nkwenye ya na Chineke. Akụkọ ya ka a kọrọ n’akwụkwọ nke Job.

Akwụkwọ nke Job

Na-agbanyeghị akwụkwọ ahụ bụ n’ihi ahụhụ nile Job tara, ọ zaghị azịza n’ozuzu banyere ajụjụ ihe butere Job (ma-ọbụ onye ọzọ) ga-eji hụ ahụhụ mgbu na nfunarị nke ezi na ụlọ ya na arịa nile. Akwụkwọ ahụ kọwara ebe o doro anya na inwe mkpagbu nile a pụtaghị na mmadụ e mehiewo. Onye-nwe nwere ike iji mkpagbu maka inweta uche site n’ihe, ezigbo ọzụzụ, na ntụzi-aka ya na kwa maka ntaram ahụhụ (OznỌd. 122).

E nwere ike ikewasị akwụkwọ ahụ mpaghara anọ. Isi nile nke 1–2 bụ okwu mmalite nye akụkọ ahụ. Isi nile nke 3–31 kọrọ otu usoro mkparita-ụka n’etiti Job na ndị enyi atọ. Isi nke 32–37 nwere okwu nile nke Elaihu, onye enyi nke anọ, onye mara Job ikpe n’ihi uche nile ndị ọzọ na-abụghị n’ihi uche nile nke ndị enyị atọ nke mbụ ahụ. Isi nile nke 38–42 jiri inye Job nkwesi ike mechie akwụkwọ ahụ na ụzọ njem ya bụ nke dị mma site na mmalite.

Akwụkwọ nke Job na-akụzi na ọ bụrụ na onye ọbụla e nwere mmata ziri ezi nke Chineke ma na-ebi ndụ nke Chineke nabatara, ọ ga-enwe ike karịa ụdị nnwale nile na-abịakwasị ya. Okwukwe Job na-adaghi-ada ka e jiri ụdị iti mkpu ndị dịka nke a mara, “Na-agbanyeghị na ọ ga-egbu m, mana aga m atụkwasị ya obi” (Job 13:15). A kpọtụkwara Job na Ezikiel 14:14; Jemes 5:11; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 121:10.