Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Elaisha


Elaisha

Otu onye-amụma Testament Ochie nke mpaghara ala-eze nke Elu-elu Israel, Onye ndụmọdụ atụkwasara obi nye ọtụtụ ndị eze nile nke ala ahụ.

Elaisha nwere ịdị nwayọ na mụọ omume ịhụnanya na-ejighị iyi egwu nke ọnụnụ ọkụ obi nke e jiiri mara nna ya ukwu. Ọrụ ebube ya nile a maara ama (2 Ndez. 2–5; 8) na-agba ama na o nwetara n’ezi-okwu ike nke Elaịja mgbe ọ nọchiri anya Elaịja dịka onye-amụma (2 Ndez. 2:9–12). Iji maa-atụ ọ gwọrọ mmiri nile nke nkume ebe mmiri ilu si asụpụta, kewaa mmiri nile nke Osimiri Jọdan, mụbaa mmanụ nwanyị di ya nwụrụ, kulite nwa nta nwoke site n’ọnwụ, gwọọ onye ekpenta, mee ka egbugbụ (onyi-ike) igwe see n’elu mmiri, na jiri ikpu isi tie ndị Siria ihe otiti (2 Ndez. 2–6). Ije ozi ya nọrọ karịa iri afọ ise n’oge ọchịchị nile nke Jehoram, Jehu, Jehohaz, na Joash.